5 O dinara nʼokpuru osisi brum rahụ ụra.
Ma lee, otu oge ahụ, mmụọ ozi metụrụ ya aka, sị ya, "Bilie, rie nri." 6 Ịlaịja biliri legharịa anya, hụ ogbe achịcha na ite mmiri nta nke dị nʼakụkụ ebe ọ tụkwasịrị isi ya. O riri ogbe achịcha ahụ a hụrụ nʼicheku ọkụ, ṅụọkwa mmiri ahụ. Emesịa, o dinakwara ọzọ.