Ndị Kraịst na ndị na-ekweghị ekwe
14 Unu ekwela ka unu na ndị na-ekweghị ekwe nwee nkekọta ọbụla. Nʼihi na gịnị ka ezi omume na ajọ omume nwekọrọ? Olee ụdị mmekọ ìhè na ọchịchịrị ga-enwekọ? 15 Ọ bụ nwekọ dị aṅaa dị na-agbata Kraịst na ekwensu? Gịnịkwa ka onye kwere ekwe na onye na-ekweghị ekwe nwekọrọ? 16 Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru,
"M ga-ebi nʼime ha.
Jegharịakwa nʼime ha.
M ga-abụkwa Chineke ha,
ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m."6:16 Lev 26:12; Jer 32:38; Izk 37:27
17 Ya mere,
"Sinụ nʼetiti ha pụta.
Nọpụkwanụ iche nʼebe ha nọ.
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka.
Mụ onwe m ga-akpọbatakwa unu."6:17 Aịz 52:11; Izk 20:34,41