16 Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru,
"M ga-ebi nʼime ha.
Jegharịakwa nʼime ha.
M ga-abụkwa Chineke ha,
ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m."6:16 Lev 26:12; Jer 32:38; Izk 37:27