Pular para o conteúdo
Publicidade

2 Ndị Eze 4

Nwanyị Shunem na nwa ya

8 Otu ụbọchị, Ịlaisha gara nʼobodo Shunem. Otu nwanyị nwere ugwu bi nʼebe ahụ. Nwanyị ahụ rịọsiri ya ike ka o rie nri. Nʼihi ya, mgbe ọbụla Ịlaisha si nʼebe ahụ gafee, na-akwụsị nʼebe ahụ rie ihe. 9 Ma nwanyị ahụ gwara di ya okwu sị, "O doro m anya nke ọma na nwoke a na-akwụsị nʼụlọ anyị mgbe niile bụ onye nsọ nke Chineke. 10 Biko, ka anyị doziere ya otu ọnụụlọ nta nʼime ụlọ elu anyị, ka anyị tinyere ya ihe ndina na tebul, na oche, na oriọna, ka o nwee ebe ga na-anọ mgbe ọbụla bịakwutere anyị."

11 Otu ụbọchị, mgbe Ịlaisha bịakwara nʼebe ahụ, bara nʼọnụụlọ ahụ, dinaa nʼebe ahụ. 12 sịrị Gehazi onye na-ejere ya ozi, "Gaa kpọọ onye Shunem a," Ya mere, kpọrọ ya, bịara guzo nʼihu ya, 13 Ịlaisha gwara Gehazi, "Gwa nwanyị ahụ, sị, Lee, otu i si enye onwe gị nsogbu niile ndị a maka anyị. Ugbu a, gịnị ka a ga-emere gị? bụ ka anyị gwa eze okwu banyere gị, ka bụ ịgwa onyeisi ndị agha?’ "

zara, "Ebi m nʼetiti ndị m."

14 Ịlaisha jụrụ, "Gịnịkwa ka anyị ga-emere nwanyị a?"

Gehazi sịrị, "Nʼezie, o nweghị nwa nwoke, di ya emeekwala agadi."

15 Ịlaisha sịrị, "Kpọọ ya." Ya mere, Gehazi kpọrọ ya, bịara guzo nʼọnụ ụzọ. 16 Ịlaisha sịrị, "Na mgbe dị otu a nʼafọ ọzọ, ga-eku nwa nwoke nʼaka gị abụọ."

sịrị, "Mba, onyenwe m, biko, gị onye nke Chineke, agwala ohu gị nwanyị okwu ụgha."

17 Ma dịka Ịlaisha si kwuo, nwanyị ahụ tụụrụ ime, na mgbe ahụ nʼafọ ọzọ ya, mụrụ nwa nwoke.

18 Nwata ahụ toputara, otu ụbọchị pụrụ jekwuru nna ya nʼubi, ebe ha nọ na-aghọ ọka. 19 O tikuru nna ya sị ya, "Isi m o, isi m o!"

Nna ya sịrị otu nʼime ndị ohu ya, "Kuru ya kulaara nne ya." 20 O kuuru ya, kulaara ya nne ya, nwantakịrị nwoke ahụ nọdụrụ nʼapata nne ya ruo etiti ehihie, mgbe nwụrụ. 21 Nne ya kuuru ya rigoo nʼelu ụlọ ahụ, tọgbọ ya nʼelu ihe ndina ahụ onye nke Chineke ahụ na-edina, mechie ụzọ pụọ.

22 O ziri ozi kpọọ di ya sị ya, "Biko, zitere m otu okorobịa na otu ịnyịnya ibu, ka m jekwuru onye Chineke ahụ. Aga m alọtakwa ọsịịsọ."

23 sịrị, "Gịnị mere i ji ejekwuru ya taa? bụghị Ọnwa ọhụrụ, bụghịkwa ụbọchị izuike."

zara sị, "Udo dị."

24 Mgbe ahụ, nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya ibu ahụ, nye nwokorobịa ahụ iwu sị ya, "Gbasie ọsọ ike. Akwụsịkwala ịgba ọsọ ma bụghị mgbe m gwara gị kwụsị." 25 Ya mere, o buliri ije,4:25 Njem a, ga-abụ ihe dị ka kilomita iri atọ site nʼobodo Shunem ruo nʼugwu a. gakwuru onye nke Chineke nʼugwu Kamel.

Mgbe o lepụrụ anya hụ ya ka na-abịa, onye nke Chineke sịrị odibo ya bụ Gehazi, "Lee nwanyị Shunem ahụ. 26 Gbara ọsọ gaa zute ya jụọ ya sị ya, dịkwa mma? Dị gị nọkwa nʼudo? Nwa gị nọkwa nʼudo?’ " Mgbe Gehazi zutere ya jụọ ajụjụ ndị a, nwanyị ahụ zara Gehazi sị ya,

"E, anyị niile nọ nʼudo, ihe niile na-aga nke ọma."

27 Ma mgbe bịakwutere onye nke Chineke, dara nʼala nʼihu ya, jide ya nʼụkwụ ya abụọ. Gehazi bịaruru nso inupu ya, ma onyeozi Chineke sịrị ya, "Hapụ ya aka, nʼihi na dị ihe na-enye ya nsogbu nʼime mmụọ ya, ma Onyenwe anyị zonarịrị m ya, gwaghịkwa m ihe mere."

28 Nwanyị ahụ sịrị, "Onyenwe m, arịọrọ m gị nye m nwa nwoke? bụ na m asịghị gị, emeela m ka m nwee olileanya?"

29 Ịlaisha sịrị Gehazi, "Ngwa, were ihe ike nʼukwu jikọta uwe mwụda gị, werekwa mkpanaka m nʼaka gị, bilie gaa Shunem. Mgbe na-aga ekelekwala onye ọbụla ekele. bụrụkwa na onye ọbụla ekelee gị, azala ekele ya. Gaa nʼụlọ ahụ. I ruo, tụkwasị mkpanaka m nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ."

30 Ma nne nwantakịrị ahụ zara sị, "Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị laa." Ịlaisha biliri soro ya bido ịla nʼụlọ ya.

31 Ma Gehazi butere ụzọ rute nʼụlọ ahụ, were mkpanaka ahụ tụkwasị nʼihu nwantakịrị nwoke ahụ, ma nke a emeghị ka nwantakịrị ahụ teta ma bụkwanụ kuo ume. Ya mere, Gehazi laghachiri izute Ịlaisha, gwa ya sị, "Nwata ahụ etetaghị."

32 Mgbe Ịlaisha rutere nʼụlọ ahụ, hụrụ ka nwantakịrị ahụ nwụrụ anwụ dina nʼelu ihe ndina ya. 33 banyere nʼime ọnụụlọ ahụ, mechibido ha abụọ ụzọ, kpee ekpere, kpọkuo Onyenwe anyị. 34 Emesịa, makpuuru nʼelu nwantakịrị ahụ, tụkwasị ọnụ ya nʼọnụ nwantakịrị ahụ, na anya ya abụọ na nke nwantakịrị ahụ, na aka ya abụọ na nke ya. Mgbe o si otu a dinara nʼelu nwantakịrị ahụ, ahụ nwantakịrị ahụ malitere ikpo ọkụ ọzọ. 35 Ịlaisha biliri jegharịa nʼime ụlọ ahụ ugboro ole na ole, laghachikwa makpuru nʼelu nwantakịrị ahụ ọzọ. Emesịa, nwantakịrị ahụ zere uzere ugboro asaa, meghe anya ya abụọ.

36 Ịlaisha kpọrọ Gehazi sị ya, "Kpọọ nwanyị Shunem." Ya mere, kpọrọ ya. Mgbe bịakwutere ya, sịrị, "Kuru nwa gị." 37 batara, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọ isiala. Emesịa, o kuuru nwa ya nwoke pụọ.

Veja também