Publicidade

3 João 1

1 bụ okenye ahụ,

Na-edegara Gaiọs, onye ahụrụ nʼanya akwụkwọ a, bụ onye m hụrụ nʼanya nʼeziokwu.

2 Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka na-agara mkpụrụobi gị nke ọma. 3 Aṅụrịrị m ọṅụ nke ukwu, mgbe ụfọdụ ụmụnna bịara gbaa ama banyere ikwesi ntụkwasị obi gị nye eziokwu, na otu i si nọgide na-agbaso eziokwu ahụ. 4 O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu.

Gaiọs rụziri ọrụ ya

5 Onye m hụrụ nʼanya, i kwesiri ntụkwasị obi nʼihe ọbụla nke na-emere ụmụnna, bụ ezie na ha bụ ọbịa nye gị. 6 Ha akọọlara nzukọ banyere ịhụnanya gị. Biko, mgbe ha na-apụ, nyekwara ha aka nʼije ha nʼụzọ ga-enye Chineke otuto. 7 bụ nʼihi aha ahụ ka ha biliri ije, na-anaraghị enyemaka ọbụla site nʼaka ndị na-ekweghị ekwe. 8 Nke a mere o ji kwesi ekwesi na anyị ga-elekọta ndị dị otu a anya ka anyị bụrụ ndị so ha na-ejikọta aka nʼotu nʼọrụ eziokwu ahụ.

Esokwala nzọ ụkwụ Diotrefis

9 Edere m akwụkwọ ozi zigara nzukọ ahụ, ma Diotrefis onye na-atọ ụtọ ịbụ onye mbụ, anabataghị anyị nke ọma. 10 Ya mere, bụrụ na m abịa, aga m eme ka ihe niile na-eme na ọtụtụ ihe niile na-ekwu megide anyị pụta ìhè. bụghị naanị na afọ ejughi ya nʼihi ihe ndị a niile, jụrụ ịnabata ndị ụmụnna, ma na-egbochi ndị ọzọ chọrọ ịnabata ha ka ha ghara ime otu ahụ. na-achụpụkwa ha site nʼụlọ nzukọ.

11 Onye m hụrụ nʼanya, eṅomila ihe dị njọ kama ṅomie ihe dị mma. Onye ọbụla na-eme ezi ihe na-egosi na o si na Chineke. Onye bụlakwa na-eme ajọ ihe ahụbeghị Chineke anya. 12 Onye ọbụla na-agba ezi ama banyere Dimitriọs bụladị eziokwu ahụ nʼonwe ya. Anyị na-ekwukwa ezi ihe banyere ya. makwaara na bụ ezi ama ka anyị na-agba.

13 Enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere gị nʼakwụkwọ, ma achọghị m iji mkpisi odee na inki dee ha. 14 bụ olileanya m ịbịa ịhụ gị nʼoge na-adịghị anya. Mgbe ahụ anyị ga-anọdụ ala kwuo ihe niile nʼihu nʼihu.

15 Ka udo dịrị gị.

Ndị enyi niile nọ nʼebe a na-ekele gị. Kelekwa ndị enyi niile nọ nʼebe ahụ nʼaha nʼaha.

Veja também

Publicidade
3 João
Ver todos os capítulos de 3 João
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-