2 Onye m hụrụ nʼanya, ekpere m bụ na ahụ ga-esi gị ike, ka ihe na-agara gị nke ọma, dịka ọ na-agara mkpụrụobi gị nke ọma. 3 Aṅụrịrị m ọṅụ nke ukwu, mgbe ụfọdụ ụmụnna bịara gbaa ama banyere ikwesi ntụkwasị obi gị nye eziokwu, na otu i si nọgide na-agbaso eziokwu ahụ. 4 O nweghị ihe na-enye m ọṅụ karịa ịnụ na ụmụ m na-agbaso eziokwu.
Publicidade