Pular para o conteúdo
Publicidade

Mkpughe 13

16 O nyere iwu ka onye ọbụla, onye ukwu na onye nta, ọgaranya na ogbenye, ohu na onye nwe onwe ya, nata akara nʼaka nri maọbụ nʼegedege ihu ha. 17 Ya mere, dịghị onye ọbụla nwere ike ịzụ ahịa maọbụ ree ahịa ma bụrụ na onye ahụ enweghị akara a, nke bụ aha anụ ọhịa ahụ, maọbụ ihe e ji mara ya, maọbụ ọnụọgụgụ nọchiri aha ya.

18 Nke a ka chọrọ amamihe maka ịghọta ya. Ka onye ọbụla nwere ọgụgụisi, gụọ ọnụọgụgụ nke anụ ọhịa ahụ, nʼihi na bụ ọnụọgụgụ mmadụ.13:18 Nke a bụ akara ọnụọgụgụ mmadụ e kere eke. Ọnụọgụgụ ahụ bụkwa narị isi na iri isi na isii, ya bụ 666.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também