Publicidade

Apocalipse 2

Nzukọ dị nʼEfesọs

1 "Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nʼEfesọs, sị ya:

Ihe ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ na-ejide kpakpando asaa nʼaka ya, ma na-ejegharịkwa nʼetiti ihe ịdọba oriọna ọlaedo asaa ndị ahụ.

2 Amaara m ihe niile banyere ọrụ gị niile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachiobi gị. Amaara m na dịghị anagide ndị ajọ omume, na nwaleela ndị ahụ niile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nʼezie, chọpụtakwa na ha bụ ndị ụgha. 3 I jirila ntachiobi nagide nhụju anya nʼihi aha m, ma ike agwụghị gị.

4 Ma enwere m ihe ndị a megide gị. hapụla ịhụnanya mbụ ahụ i nwere. 5 Cheta ọnọdụ i si na ya daa. Chegharịa, mekwa ihe ndị ahụ na-eme na mbụ. bụrụ na i meghị otu a, aga m abịa wepụ ihe ịdọba oriọna gị site nʼọnọdụ ya. 6 bụladị otu a, o nwere ihe ụfọdụ dị mma banyere gị. kpọrọ ọrụ ọjọọ nke ndị Nikolaitan asị, dịka mụ onwe m si kpọọ ya asị.

7 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye ike iri mkpụrụ sitere nʼosisi ndụ ahụ nke dị na paradaịs nke Chineke.

Nzukọ dị na Smyrna

8 "Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smyrna, sị ya:

Ihe ndị a bụ okwu ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe niile. Onye nwụrụ anwụ ma dịkwa ndụ ọzọ.

9 Amaara m mkpagbu gị niile na ịda ogbenye gị. Ma nʼezie, bụ ọgaranya. Amaara m ihe banyere nkwutọ niile ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị Juu na-ekwutọ gị, ma ha abụghị ndị Juu, nʼezie ha bụ ụlọ nzukọ ekwensu. 10 Atụkwala egwu nʼihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nʼihi na ekwensu nʼonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nʼime ndị gị nʼụlọ mkpọrọ, ka o jiri ya nwalee gị. A ga-akpagbu unu abalị iri. Ma gosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, bụladị ruo mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, a ga m enye gị okpueze ahụ, bụ ndụ.

11 Onye ọbụla nwere ntị ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. Onye ọbụla na-emeri emeri, ọnwụ nke ugboro abụọ agaghị emekpa ya ahụ.

Nzukọ dị nʼobodo Pegamọm

12 "Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị Pegamọm, sị ya:

Ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ ji mma agha ahụ dị nkọ nke nwere ihu abụọ nʼaka ya.

13 Amaara m ebe i bi, bụ obodo ebe ekwensu nwere ocheeze ya. Ma na-anọgidesi ike nʼaha m. jụrụ ịgọnarị okwukwe gị nʼime m, bụladị nʼoge Antipas onyeama m kwesiri ntụkwasị obi, bụ onye e gburu nʼobodo unu, ebe ekwensu bi.

14 Ma enwere m ihe ole ma ole megide gị. I nwere ụfọdụ mmadụ ebe ahụ, ndị jidesiri nkuzi Belam ike, bụ onye kuziiri Balak ka o raa ụmụ Izrel ụra nke mere ka ha mehie, rie ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị, kwaakwa iko. 2:14 Ọ bụ Belam kuziri Balak ụzọ ọ ga-esi rara ndị Izrel nye na nnupu isi megide iwu Chineke nyere ha banyere ife arụsị, nʼakwụkwọ Ọnụ 31:15-16, ịkwa iko na ịlụ di maọbụ nwunye site na mba ọzọ. Iwu ndị a dị nʼakwụkwọ Dit 7:3-11. 15 Nʼotu aka ahụ, i nwekwara ụfọdụ mmadụ ndị jidesiri nkuzi Nikolaitan ike. 16 Ya mere, chegharịa! Ma bụghị otu a, aga m abịakwute gị ọsịịsọ jiri mma agha dị m nʼọnụ buso ha agha.

17 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile. bụ naanị onye na-emeri emeri ka m ga-enye ụfọdụ nʼime achịcha mánà ahụ e zoro ezo. Aga m enyekwa onye ahụ ezi nkume ọcha ahụ, nke edekwasịrị aha ọhụrụ nʼelu ya, nke onye ọbụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ natara ya.

Nzukọ dị nʼobodo Tiatira

18 "Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira, sị ya:

Ndị a bụ okwu sitere nʼaka Ọkpara Chineke, onye anya ya na-enwuba nʼebe niile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka bronz a nụchara nke ọma.

19 Amaara m ọrụ gị niile, na ịhụnanya gị, na okwukwe gị. Amakwaara m ije ozi gị na ntachiobi gị, na-ahụkwa na na-arụ ọrụ ugbu a karịa ka i mere na mbụ.

20 Ma enwere m ihe ndị a megide gị. na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị 2:20 Onye amụma nwanyị Ọ bụ onye amụma ụgha nʼihi na ihe ọ na-akụzi megidere iwu Chineke. nye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja. 21 Enyela m ya ohere ka o si na mmehie ya chegharịa, ma jụrụ ichegharị site na ndụ ịkwa iko. 22 Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha. 23 Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya.

24 Ugbu a, ana m agwa unu ndị fọdụrụ na Tiatira, unu ndị na-agbasoghị ozizi ya, ndị na-amụtabekwaghị ihe ndị ahụ ekwensu kpọrọ ihe nzuzo dị omimi, 2:24 Ihe nzuzo dị omimi E nwere ọdị iche nʼetiti ihe omimi Mmụọ Nsọ na-ekpughe dị ka e dere nʼakwụkwọ 1Kọ 2:10, site nʼihe omimi ndị ọzọ. Ya mere, o ji dị mkpa na mmadụ ga-akpachapụ anya mgbe ọbụla onye dị otu na-achọ ịmata ụfọdụ ihe omimi, ka rịọ inyeaka mmụọ nsọ. O nweghị ibu arọ ọzọ m ga-ebokwasị unu, 25 ma bụghị, unu jidesienụ ihe unu nwere aka ike tutu ruo mgbe m ga-abịa.

26 Ma onye ọbụla na-emeri emeri, na-anọgidekwa na-eme uche m ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka m ga-enye ikike nʼebe mba niile nọ. 27 Onye ahụ, ga-eji mkpara igwe chịa ha, dịka mgbe a kụwachara ite aja na mpekele na mpekele.2:27 Abụ 2:9 bụladị ka Nna m si nye m ike, 28 a ga-enye onye nke meririnụ kpakpando ụtụtụ. 29 Onye ọbụla nwere ntị, ya nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ niile.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-