20 Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezebel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị 2:20 Onye amụma nwanyị Ọ bụ onye amụma ụgha nʼihi na ihe ọ na-akụzi megidere iwu Chineke. nye ya ohere ka o were nkuzi asị na-eduhie ndị ohu m ụzọ, ka ha kwaa iko, riekwa ihe e ji chụọrọ arụsị aja.