Nzukọ dị nʼobodo Sardis
1 "Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis, sị ya:
Ndị a bụ okwu onye ahụ nwere mmụọ asaa nke Chineke na kpakpando asaa.
Amaara m ọrụ gị niile, ị nwere aha dịka onye dị ndụ ma ị bụ onye nwụrụ anwụ. 2 Ugbu a, sị nʼụra bilite. Mee ka ihe ntakịrị ahụ fọdụrụ na-achọ ịnwụ anwụ dịrị ike. Nʼihi na ọ dịghị ọrụ gị m hụrụ dị ka ihe zuruoke nʼanya Chineke m.