16 ‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ.
Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla.
Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’
okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ.
17 Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ
ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha;
‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’
‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’"