17 " ‘Chineke sịrị, nʼoge ikpeazụ,
aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.
Ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma,
ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ,
ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
18 Ọ bụladị ndị ohu m, nwoke ha na nwanyị nʼime ha,
ka m ga-awụkwasị Mmụọ m.
Ha ga-ebukwa amụma.