Pular para o conteúdo
Publicidade

Colossenses 1

12 na-enyenụ Nna ekele site nʼọṅụ, onye mere ka anyị kwesi iketa oke nʼihe nketa nke ndị nsọ nʼime alaeze nke ìhè. 13 Nʼihi na napụtara anyị site nʼike nke ọchịchịrị, bịa kpọfee anyị nʼalaeze nke Ọkpara ya hụrụ nʼanya. 14 Onye anyị si nʼime ya nwee nzọpụta, nke bụ mgbaghara mmehie niile.

Onye Kraịst bụ, na ihe o mere

15 bụ nnọọ onyinyo Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya, bụrụkwa onye mbụ a mụrụ nʼihe niile e kere eke. 16 Nʼihi na nʼime ya ka e ji kee ihe niile dị nʼụwa na nke dị nʼeluigwe, na ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya, ma ocheeze niile, ike niile, ịchị isi niile na ike ọchịchị niile. E kere ihe niile site nʼaka ya nakwa nʼihi ya. 17 Ya onwe ya nọ tupu ekee ihe niile, bụkwa nʼime ya ka ejikọtara ihe niile nʼotu.

Veja também

Colossenses
Ver todos os capítulos de Colossenses