Ikpere arụsị
9 Mgbe ị banyere nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, amụtakwala ime omume arụ dịka ndị mba bi nʼala ahụ. 10 Ka a hapụ ịchọta onye ọbụla nʼetiti gị nke na-ewere nwa ya nwoke maọbụ nwanyị nye ka a kpọọ ya ọkụ nʼihi ịchụrụ chi ndị mba ọzọ aja. Ka onye Izrel ọbụla ghara ịbụ onye na-ajụ mmụọ ase maọbụ onye mgbaasị maọbụ na-agba aja, 11 maọbụ onye na-akụ mmadụ ibe ya ọgwụ, maọbụ onye na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, maọbụ dibịa afa maọbụ onye na-ajụ ase site nʼaka ndị nwụrụ anwụ. 12 Onye ọbụla na-eme ihe ndị a bụ onye Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụkwa nʼihi ihe arụ ndị a ka Onyenwe anyị Chineke gị ji na-achụpụ ndị bi nʼala a.