Pular para o conteúdo
Publicidade

Deuteronômio 22

Mmekọrịta nwoke na nwanyị

13 bụrụ na nwoke alụọ nwaagbọghọ, mesie mgbe o dinakwuru ya kpebie nʼobi ya na chọkwaghị ịlụ ya ọzọ, 14 bụrụ na nwoke a ekwutọọ nwaagbọghọ ahụ, mebie aha ya kwuo na nwaagbọghọ ahụ amatalarị nwoke tupu ha abụọ alụọ, 15 nne nwaagbọghọ ahụ, na nna ya, ga-ewere ihe ga-egosi na nwa ha amabeghị nwoke gaa nʼihu ndị okenye obodo ahụ, nʼọnụ ụzọ ama. 16 Nna nwaagbọghọ ahụ ga-agwa ndị okenye, "Enyere m nwoke a nwa m nwanyị dịka nwunye, ma ugbu a, chọkwaghị ịlụ ya. 17 Ugbu a, o boola ya ebubo ihere, sị, Achọpụtaghị m ihe ọbụla nʼahụ nwa gị nwanyị a ihe na-egosi na maghị nwoke.Ma nke a bụ ihe ngosi na ada anyị amaghị nwoke." Mgbe ahụ ndị mụrụ ya ga-agbasapụ akwa ahụ nʼihu ndị okenye obodo ahụ.

Veja também