Pular para o conteúdo
Publicidade

Diuteronomi 9:18,19,25,26

18 Mgbe ahụ, adara m nʼala ọzọ nʼihu Onyenwe anyị. Iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, erighị m nri maọbụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ ọbụla, nʼihi mmehie niile unu mere. Unu mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị si otu a kpasuo ya iwe nke ukwuu. 19 Atụrụ m egwu iwe na ọnụma nke Onyenwe anyị, nʼihi na iwe ya dị ukwuu megide unu ruo na ikpochapụ unu. Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gere ntị nʼarịrịọ m.

25 Ọ bụ ya mere m jiri daa nʼala nʼihu Onyenwe anyị iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, nʼihi na Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-ala unu nʼiyi. 26 Ekpere m ekpere nʼoge ahụ nye Onyenwe anyị sị ya, "Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, alala ndị gị nʼiyi, nʼihi na ha bụ ihe nketa gị, bụrụkwa ndị i ji ike aka gị na ebube gị gbapụta site nʼIjipt.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.