Pular para o conteúdo
Publicidade

Ndị Efesọs 2

Ịbụ otu anyị nʼime Kraịst

11 Ya mere, chetanụ na nʼoge gara aga, unu bụ ndị mba ọzọ site nʼọmụmụ nke a mụrụ unu. Chetakwanụ na "ndị e biri ugwu" na-akpọkwa unu "ndị a na-ebighị ugwu" (nʼihi obibi ugwu nʼanụ ahụ nke eji aka bie). 12 Nʼoge ahụ, dịghị ihe jikọtara unu na Kraịst. E kewapụtara unu site na mmekọrịta nke Izrel, bụrụkwa ndị ọbịa nʼọgbụgba ndụ ahụ, na-enweghị olileanya na-enweghịkwa Chineke nʼime ụwa. 13 Ma ugbu a nʼime Kraịst Jisọs, unu bụ ndị nọ nʼebe dị anya nʼoge gara aga, ka e mere ka unu bịaruo nso site nʼọbara Kraịst nke a wụsiri.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.

Veja também