Pular para o conteúdo
Publicidade

Ndị Efesọs 4:1-12

Ịdị nʼotu nke anụ ahụ Kraịst

1 Ya mere, mụ onwe m bụ onye mkpọrọ nke Onyenwe anyị, na-arịọ unu ka unu bie ndụ kwesiri ọkpụkpọ nke a kpọrọ unu. 2 Werekwanụ obi dị umeala niile na ịdị nwayọọ, na ndidi na-anagide ibe unu nʼịhụnanya. 3 Nọọnụ nʼudo nʼetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nʼotu unu dịgide nʼime Mmụọ Nsọ. 4 E nwere otu ahụ na otu Mmụọ, dị ka e siri kpọọ unu nʼotu olileanya nke dịịrị ọkpụkpọ a kpọrọ unu. 5 Otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim. 6 Ọ bụkwa naanị otu Chineke dị onye bụ Nna ihe niile na onye na-achị ihe niile, na onye na-arụ ọrụ ya nʼime ihe niile, na-ebikwa nʼime ihe niile.

7 Ma e nyere onye ọbụla amara dịka oke onyinye nke Kraịst siri dị. 8 Nʼihi nke a, e kwuru,

"Mgbe ọ rigoro gaa nʼelu,

o duuru igwe ndị a dọtara nʼagha,

nyekwa ụmụ mmadụ onyinye dị iche iche."4:8 Abụ 68:18

9 (E kwuru, "Ọ rigoro," gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na o buru ụzọ rịdaa nʼime ala mmụọ? 10 Onye ahụ si nʼelu rịdata bụkwa otu onye ahụ rigoro nʼeluigwe, ka o nwee ike mejuo ihe niile.) 11 O nyekwara ụfọdụ onyinye ị bụ ndị ozi, ụfọdụ ndị amụma, ụfọdụ ndị nkwusa oziọma, ụfọdụ ndị ụkọchukwu na ndị nkuzi. 12 Nke a bụ maka ikwadobe ndị nsọ maka ọrụ nke ije ozi, iji wulite ahụ nke Kraịst;

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.