11 "Ụwa niile maara nke ọma na onye ọbụla, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị, banyere nʼime ime ụlọeze mgbe eze na-akpọghị ya, ga-anwụ, karịakwa ma eze o setịpụrụ mkpara ọlaedo ya gosi onye ahụ na ọ nabatara ọbịbịa ya. Ugbu a, o meela ihe dị ka otu ọnwa kemgbe eze na-ezibeghị ozi ka a kpọọ m."
14 Ọ bụrụ na ị gba nkịtị nʼoge a, oghere na napụta ndị Juu ga-esite nʼụzọ ọzọ bịa, ma gị onwe gị na ụlọ nna gị ga-ala nʼiyi. Onye makwanụ ihe mere i ji nọrọ nʼụlọeze nʼoge dị otu a?"
16 "Gaa kpọkọtaa ndị Juu niile bi na Susa, bukwaaranụ m ọnụ. Unu erila ihe ọbụla, maọbụ ṅụọ ihe ọbụla abalị atọ, ehihie na abalị. Mụ onwe m kwa, na ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi, ga-emekwa otu ihe ahụ. Emesịa, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe megidere iwu, ma aga m aga hụ eze anya. Ihe ọ pụtara ya pụta. Ọ pụtara m ọnwụ, ka m nwụọ!"