Pular para o conteúdo
Publicidade

Ester 7

Mkwụgbu Heman

1 Eze na Heman gara iri oriri ahụ Esta nwunye eze kpọrọ ha, 2 mgbe ha nọ na-aṅụ mmanya, nʼụbọchị nke abụọ ahụ, eze jụrụ Esta ajụjụ sị, "Gịnị bụ arịrịọ gị, Esta, eze nwanyị? Gịnị ka chọrọ? Ihe ọbụla bụ, aga m enye gị ya, bụladị otu ọkara alaeze m."

3 Nʼikpeazụ, Esta nwunye eze zara sị, "Eze biko, bụrụ na m ahụtala amara nʼihu gị, bụrụkwa na masịrị gị, zọpụta ndụ m na ndụ ndị m. 4 Nʼihi na mụ na ndị m abụrụla ndị erere ere nʼaka ndị ga-ala anyị nʼiyi. Anyị abụrụla ndị a ga-egbu, na ndị aghaghị ịla nʼiyi. A sị na e rere anyị dịka ndị ohu nwoke na nwanyị, agaara m agba nkịtị, hapụ inye gị nsogbu, ma nʼihi nʼọdịghị ihe ga-akwụ ụgwọ isogbu eze."

5 Eze, bụ Sekses, jụrụ Esta, bụ nwunye eze, "Onye ka mmadụ ahụ bụ, olee ebe nọ, bụ onye na-ezube ime ihe ọjọọ dị otu a?"

6 Esta zara, "bụ onye iro na onye mmegide. bụ Heman, nwoke ọjọọ a!"

Mgbe ahụ, ụjọ dị ukwu jidere Heman nʼihu eze na nwunye eze. 7 Eze biliri ọtọ nʼiwe,7:7 1:12 hapụ mmanya ya site nʼebe oriri ahụ pụọ, gaa nʼime ubi ya a gbara ogige dị nʼụlọeze. Ma Heman nọdụrụ ịrịọ eze nwanyị, bụ Esta arịrịọ maka ndụ ya, nʼihi na maara na eze ekpebiela ịla ndụ ya nʼiyi.

8 Mgbe eze sitere nʼubi a gbara ogige lọghachita nʼụlọ oriri ahụ, lee ka Heman tụrụ onwe ya nʼelu oche ahụ Esta na-adabere nʼelu ya.

Eze sịrị, "chọrọ iwedakwa nwunye eze nʼala nʼihu m nʼụlọ m?"

Ngwangwa okwu a si nʼọnụ eze pụta, ha kpuchiri Heman akwa nʼihu.7:8 Ị ji akwa kpukwasị mmadụ nʼihu, maọbụ iji akwa kpuchie isi mmadụ nʼoge ahụ, ọkachasị ma ọ bụrụ nʼihe metụtara eze, pụtara na a maala onye dị otu a ikpe ọnwụ. 9 Mgbe ahụ kwa, Habona otu nʼime ndị ozi eze gwara eze sị, "Onyenwe m, lee na Heman enyela iwu ka a kwadoo osisi nke ịdị elu ya bụ iri mita abụọ na atọ, ebe chọrọrị ịnọ kwụgbuo Mọdekai, nwoke ahụ mere ka a ghara igbu eze. Osisi ahụ guzokwa ugbu a nʼihu ụlọ Heman."

Eze sịrị, "Kwụgbuonụ ya nʼosisi ahụ!" 10 Ya mere, ha kwụgburu Heman nʼosisi ahụ kwadoro maka Mọdekai. Iwe eze dajụkwara.

Veja também