11 Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu.12:11 Akpụkpọụkwụ na belịt abụghị ihe ndị mmadụ na-eyi mgbe ọbụla ha nọ nʼụlọ. Mgbe ụmụ Izrel yiri ha, ha na-ezipụta okwukwe na olileanya ha nwere banyere ọpụpụ ha site nʼala Ijipt. Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị.
Publicidade