11 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 12 "Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m Onyenwe anyị Chineke unu.’ "
13 Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel16:13 Ya bụ ọkụkụ ọgazị bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. 14 Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile. 15 Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, "Gịnị bụ nke a?"
Mosis zaghachiri ha sị, "Ọ bụ achịcha Onyenwe anyị nyere unu ka unu rie.