Ebe ịchụ aja
1 "Ị ga-eji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja. Ịdị elu ya ga-abụ otu mita na iri sentimita anọ. Ogologo ya na obosara ya ga-aha nʼotu, mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ. 2 Rụnye mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ bụrụ ihe e jikọtara nʼotu. Jiri bronz machie ebe ịchụ aja a. 3 Jiri bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ. 4 Ị ga-eme ngịga mbadamba, ihe ọkpụkpa bronz, meekwa mgbaaka bronz nke ga-adị nʼakụkụ anọ nke ngịga ahụ. 5 Tinye ya nʼokpuru oghere dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Tinye ya ka ọ dịrị nʼetiti ebe ịchụ aja ahụ. 6 Jiri osisi akashia mee mkpara osisi maka ebe ịchụ aja ahụ, were bronz machie ha. 7 A ga-eme ka mkpara ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ka ha dị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ mgbe ọbụla a na-ebu ya. 8 Jiri obodobo osisi rụọ ebe ịchụ aja ahụ, ka o nwee oghere nʼime, dịka igbe. Ị ga-arụ ya dịka e gosiri gị nʼelu ugwu ahụ.