Bezalel na Oholiab
1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 2 "Lee, ahọpụtala m Bezalel nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, 3 emejupụtakwala m ya na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta, ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche, 4 ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz, 5 ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi, na ịrụ ọrụ ǹka dị iche iche.