Pular para o conteúdo
Publicidade

Ọpụpụ 31:1-6

Bezalel na Oholiab

1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 2 "Lee, ahọpụtala m Bezalel nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda, 3 emejupụtakwala m ya na Mmụọ nke Chineke, nʼamamihe, nghọta, ihe ọmụma na ike ije ozi ọrụ ǹka dị iche iche, 4 ichepụta ihe ǹka dị iche iche, nke metụtara ọlaọcha na ọlaedo na bronz, 5 ịwa nkume na ido nkume, ịkwa ǹka osisi, na ịrụ ọrụ ǹka dị iche iche. 6 Ọzọkwa, ahọpụtala m Oholiab, nwa Ahisamak, onye si nʼebo Dan, ka ọ bụrụ onye inyeaka Bezalel.

"Enyekwala m ndị ǹka niile amara ịrụ ọrụ dị iche, nke ga-enyere ha aka ịrụ ihe ndị a niile m nyere gị iwu ịrụ:

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.