Pular para o conteúdo
Publicidade

Ọpụpụ 32:11-14,32,33

11 Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị Chineke ya arịrịọ sị ya, "Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gịnị mere iwe gị ji dị ọkụ otu a nʼebe ndị gị nọ bụ ndị nke i ji ike ebube gị, na ọtụtụ ihe ịrịbama dị ịtụnanya, dupụta site nʼala Ijipt? 12 Nʼihi gịnị ka ndị Ijipt ga-ekwu sị, ‘Ọ bụghị ime ha ihe ọjọọ ka o ji dupụta ha, ka o nwee ike gbuo ha nʼugwu ndị a, ma kpochapụkwa ha site nʼelu ụwa a?’ Site nʼiwe gị dị ọkụ chigharịa, kwere ka ọ dajụọ. Chigharịakwaa site nʼatụmatụ ọjọọ a nʼebe ndị gị nọ. 13 Cheta nkwa ahụ i kwere ndị ohu gị bụ Ebraham, Aịzik, na Izrel. Nʼihi na i ji onwe gị ṅụọ iyi nye ha sị, ‘Aga m eme ka mkpụrụ gị mụbaa dịka kpakpando nke eluigwe. Aga m enye ha ala m kwere ụmụ ụmụ gị na nkwa ka ọ bụrụ ihe nketa ha ruo mgbe ebighị ebi.’ " 14 Ya mere, Onyenwe anyị gbanwere obi ya. Ọ lakwaghị ha nʼiyi.

32 Ma ugbu a, biko, gbaghara mmehie ha. Ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha, biko hichapụ aha m site nʼakwụkwọ ahụ i dere."

33 Ma Onyenwe anyị zara sị Mosis, "Onye ọbụla mehiere megide m ka a ga-ehichapụ aha ya site nʼakwụkwọ m.

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.