6 Nʼotu ụzọ ahụ, Ebraham kweere na Chineke, a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume.3:6 Jen 15:6
7 Matanụ nke a, na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ Ebraham. 8 Dị ka ọ dị nʼAkwụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie Ebraham oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, "A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị."3:8 Jen 12:3; 18:18; 22:18 9 Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso Ebraham, nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị.