31 Tera kpọrọ nwa ya Ebram, na nwa nwa ya Lọt, onye bụ nwa Haran,11:31 Haran bụ aha mmadụ, bụrụkwa aha obodo dị nʼala Mesopotamịa. Obodo e ji ife ọnwa mara, dị ka a makwaara obodo Ụọ. na nwunye nwa ya Serai, bụ nwunye Ebram, duru ha hapụ Ụọ, obodo ndị Kaldịa, pụọ gawa nʼala Kenan. Ma mgbe ha bịarutere nʼobodo Haran, ha kwụsịrị biri nʼebe ahụ.