Pular para o conteúdo
Publicidade

Gênesis 16

Hega na Ishmel

1 Ma Serai nwunye Ebram, amụtaghị nwa. Serai nwere odibo nwanyị onye Ijipt, aha ya bụ Hega. 2 Ya mere gwara Ebram sị, "Lee, ugbu a, Onyenwe anyị egbochiela m ịmụta ụmụ.16:2 Amụtaghị nwa bụ ihe ndị mmadụ na-ahụta dị ka ntaramahụhụ si nʼaka Chineke. Ọ bụrụ na nwanyị amụtaghị nwa, nʼebe ụfọdụ, omenaala na-akwado ya ị họtara di ya nwanyị ọzọ, onye ga-amụrụ ya ụmụ. Ụmụ niile nwanyị ahụ ga-amụta na-abụ nke nwanyị ahụ na-amụtaghị nwa. Jen 20:18; 30:3 Ugbu a, bakwuru nwanyị na-ejere m ozi. Ma eleghị anya, aga m esi na ya wulite ezinaụlọ m."

Ebram kweere ihe Serai kwuru. 3 Ya mere Serai nwunye Ebram, duuru Hega, odibo nwanyị ya, onye Ijipt, dunye Ebram ka bụrụ nwunye ya. Ihe a mere na ngwụcha afọ iri site na mgbe Ebram bịara biri nʼala Kenan.

Veja também