23 Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, "Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume? 24 Ọ bụrụ na ị chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ị ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ị gaghị agbaghara18:24 Maọbụ, Ị gaghị echebe ya ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya? 25 Ọ bụghị ezi ihe na ị ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na ị gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?"
26 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara sị ya, "Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha."
32 Nʼikpeazụ, Ebraham kwuru sị, "Ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị. Ka m kwuo naanị otu ugboro a. Ọ bụrụkwanụ na a chọta naanị mmadụ iri nʼebe ahụ?"
Onyenwe anyị zara sị, "Nʼihi mmadụ iri ahụ, agaghị m ebibi ya."
33 Mgbe Onyenwe anyị gwachara Ebraham okwu, ọ hapụrụ ya gawa ebe ọ na-aga. Ebraham laghachiri azụ nʼụlọ ya.