Publicidade

Gênesis 2

21 Ya mere, Onyenwe anyị Chineke mere ka nwoke ahụ daa nʼụra. Mgbe ọ nọ na-arahụ ụra, o wepụtara otu ọgịrịga site na ngụ dị ya nʼahụ, mechikwaa ebe o si wepụta ya. 22 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ.

23 Nwoke ahụ kwuru sị,

"Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m,

na anụ ahụ si nʼahụ m,

a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’

nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya."

24 Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-18_14-04-22-