22 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke ji otu ọgịrịga o si nʼahụ nwoke ahụ wepụta, mee nwanyị, dutere ya nwoke ahụ.
23 Nwoke ahụ kwuru sị,
"Nke a bụ ọkpụkpụ si nʼọkpụkpụ m,
na anụ ahụ si nʼahụ m,
a ga-akpọ ya ‘nwanyị,’
nʼihi na e si nʼime nwoke wepụta ya."
24 Ọ bụ nke a mere nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya, e jikọta ya na nwunye ya, ha ga-abụ otu anụ ahụ.