Abimelek na Aịzik
1 Nʼoge a, ụnwụ dara nʼala ahụ. Ụnwụ a dị iche nʼụnwụ mbụ nke dara nʼoge Ebraham dị ndụ. Aịzik jekwuru Abimelek26:1 Abimelek, bụ aha ndịisi na-achị obodo a na-aza. Abimelek nke anyị nụrụ ihe banyere ya nʼakwụkwọ Jenesis isi 20, a nwụọlarị. Ọ nwụrụ ihe dịka iri afọ asatọ gara aga. Onye nke a bụ eze ọzọ. eze ndị Filistia nʼobodo Gera. 2 Onyenwe anyị gosiri Aịzik onwe ya, sị, "Agakwala Ijipt; biri nʼala ahụ m sị gị biri nʼime ya. 3 Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị. 4 Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị mụbaa, mee ka ha hie nne nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe. Ha ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m esite na mkpụrụ gị gọzie mba niile nke ụwa. 5 Ihe ndị a niile ka m ga-eme nʼihi na Ebraham rubere isi ime ihe m gwara ya, na idebe iwu m na ụkpụrụ m, na ịdọ aka na ntị m." 6 Ya mere, Aịzik nọgidere nʼobodo Gera.
7 Mgbe ndị obodo ahụ jụrụ ya banyere nwunye ya, ọ gwara ha sị, "Ọ bụ nwanne m nwanyị." Ọ tụrụ ụjọ ị sị ha, "Nwunye m ka ọ bụ," O chere nʼobi ya sị, "Ndị ikom obodo a nwere ike gbuo m nʼihi Ribeka. Nʼihi na Ribeka nʼonwe ya mara mma ile anya."
8 Mgbe Aịzik nọrọ ebe ahụ ogologo oge, Abimelek eze ndị Filistia, sitere na oghereikuku ya lepụ anya hụ Aịzik ka ọ nọ na-egwusa Ribeka nwunye ya egwu.