8 Mgbe nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ ụda njegharị Onyenwe anyị Chineke nʼogige ahụ nʼoge uhuruchi, ha zoro onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị Chineke nọ nʼetiti osisi ndị dị nʼogige ahụ. 9 Ma Onyenwe anyị Chineke kpọrọ nwoke ahụ oku sị ya, "Ebee ka ị nọ?"
10 Ọ zara si, "Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m."