Pular para o conteúdo
Publicidade

Gênesis 39

7 Mgbe oge nta gasịrị, nwunye Pọtifa lere Josef anya sị ya, "Bịa ka anyị abụọ dinaa."

8 Ma Josef jụrụ. gwara nwunye nna ya ukwu sị, "Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya. 9 O nweghị onye ọnọdụ ya dị elu karịa nke m nʼụlọ a. O gbochighị m ihe ọbụla ma bụghị gị, nʼihi na bụ nwunye ya. Olee otu m ga-esi mee oke ihe ọjọọ dị otu a, mee mmehie megide Chineke." 10 bụ ezie na nwanyị a nọgidere na-enye Josef nsogbu site nʼụbọchị ruo ụbọchị ma Josef jụrụ iso ya dinaa, jụkwa ịnọnyere ya.

11 Otu ụbọchị, Josef batara nʼime ụlọ ịrụ ọrụ ya. O nweghị ndị ọzọ na-eje ozi nọ nʼime ụlọ nʼụbọchị ahụ. 12 Nwunye Pọtifa jidere Josef nʼuwe mwụda ya, rịọọ ya sị ya, "Bịa ka anyị dinaa." Ma Josef si nʼime ụlọ ahụ gbapụ, hapụ uwe mwụda ya nʼaka nwunye Pọtifa.

Veja também