12 Mgbe ị kụrụ ihe ọbụla nʼime ya, ala agaghị enye gị mkpụrụ ya nʼuju. Site ugbu a gaa nʼihu, ị ga-abụ onye na-awagharị awagharị na onye na-abaghị nʼihe nʼụwa."
13 Ken zara Onyenwe anyị, "Ntaramahụhụ i nyere m dị ukwuu karịa nke m nwere ike ibu. 14 Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m."
15 Onyenwe anyị zara sị ya, "O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị." Ya mere, Onyenwe anyị kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya. 16 Ken sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ gaa biri nʼala Nọd,4:16 Nọd pụtara Awagharị Nke a dị nʼamaokwu 4:12,16 obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden.