Pular para o conteúdo
Publicidade

Jenesis 4:3-7

3 Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ken wetaara Onyenwe anyị ụfọdụ ihe ubi ya dịka onyinye. 4 Ma Ebel, ya onwe ya nyekwara onyinye site nʼigwe ewu na atụrụ ya e bụ ụzọ mụọ, nke mara abụba. Onyenwe anyị nabatara Ebel na onyinye ya, 5 ma ọ nabataghị Ken na onyinye ya. Nke a wutere Ken, mee ka o wee iwe dị ukwuu. Ihu ya agbarụọ.

6 Ma Onyenwe anyị jụrụ ya sị, "Gịnị mere i ji ewe iwe? Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ? 7 Ọ bụrụ na i mee ihe ziri ezi, agaghị anabata gị? Ọ bụrụkwanụ na ị jụ ime ihe ziri ezi, mmehie nọ nʼọnụ ụzọ na-eche gị ịla gị nʼiyi. Lezie anya hụ na i meriri ya."

Estes versículos te tocaram? Ore agora!

+581 estão orando agora.

Junte-se à corrente de oração.