Publicidade

Gênesis 9

8 Chineke gwara Noa na ụmụ ya sị, 9 "Ugbu a, ana m ehiwe ọgbụgba ndụ nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti agbụrụ unu ndị ga-anọchi unu, 10 na nʼetiti ihe niile nwere ndụ nke unu na ha so, ụmụ anụ ufe, na ụmụ anụ ụlọ, na ụmụ anụ ọhịa niile, ndị ahụ niile so unu si nʼụgbọ mmiri pụta, bụ ihe niile nwere ndụ nʼụwa. 11 Ebe bụ na m ehiwela ọgbụgba ndụ m nʼetiti mụ na unu, gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri kpochapụ ihe niile e kere eke, gaghị emekwa ọzọ na a ga-eji uju mmiri bibie ụwa."

12 Chineke kwuru sị, "Nke a bụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ nke m na-etinye nʼetiti mụ na unu, na nʼetiti ihe niile nwere ndụ so unu, ọgbụgba ndụ nke ga-adị nye ọgbọ niile na-abịa nʼihu. 13 Etinyela m eke na egwurugwu m na mbara eluigwe, ka bụrụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na ụwa.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-