3 Ma nke bụ eziokwu bụ na ihe aja ndị a na-eme bụ ichetara ha mmehie ha kwa afọ niile. 4 Nʼihi na ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na ọbara oke ehi na nke ụmụ ewu dị iche iche ga-asachapụ mmehie.
5 Ya mere mgbe Kraịst bịara nʼụwa, ọ sịrị,
"Aja na onyinye abụghị ihe ị chọrọ
kama ị kwadoro ahụ nye m.
6 Aja nsure ọkụ na aja a chụrụ maka mmehie,
ha abụghị ihe dị ezi mma nye gị.
7 Mgbe ahụ ka m sịrị, ‘Lee, abịala m Chineke m, ime ihe ị na-achọ.
Nke a bụkwa ihe e dere banyere m nʼime akwụkwọ mpịakọta.’ "10:7 Abụ 40:6-8
8 O kwuru na mbụ, "Aja dị iche iche, na onyinye, na aja nsure ọkụ na aja mmehie adịghị atọ gị ụtọ, ha adịghịkwa amasị gị" (a chụrụ aja ndị a dịka iwu si dị). 9 O kwukwara ọzọ, "Lee abịala m ime uche gị." Ọ kagburu aja nke mbụ ahụ ma were aja nke abụọ dochie nʼọnọdụ ya. 10 Site nʼime uche Chineke, e mere ka anyị dị nsọ site nʼaja Jisọs Kraịst ji onwe ya chụọ naanị otu ugboro.