5 Unu echefuola okwu nkasiobi ahụ, nke e jiri gbaa unu ume dịka ụmụ,
"Nwa m ewela ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị dịka ihe dị mfe, mgbe ọ na-ata gị ahụhụ
maọbụ daa mba mgbe ọ na-abara gị mba.
6 Nʼihi na onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba.
Ọ bụkwa onye ọ nabatara dị ka nwa ya, ka ọ na-apịa ụtarị."12:6 Ilu 3:11,12
7 Tachie obi, mụta ihe site nʼahụhụ. Nʼihi na Chineke na-emeso unu mmeso dị ka nna ọbụla hụrụ ụmụ ya nʼanya si emeso ha mmeso. Nwata ọbụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba. 8 Ya mere ọ bụrụ na a dịghị abara unu mba dịka esi bara ndị ọzọ, unu abụghị ụmụ kama unu bụ ndị amụtara nʼịkwa iko. 9 Dịka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nʼanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọbụla anyị nupuru isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesikwaghị ka anyị rubere Nna nke mmụọ isi karịa ma dịkwa ndụ? Anyị mee nke a, anyị ga-adị ndụ.