Ịdọ aka na ntị banyere ekweghị ekwe
7 Ya mere, dị ka Mmụọ Nsọ na-asị,
"Ọ bụrụ na unu anụ olu ya taa,
8 unu emela ka obi unu sie ike,
dị ka unu mere nʼoge nnupu isi
mgbe oge ọnwụnwa nʼime ọzara,
12 Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ omume niile na ekweghị ekwe niile nke obi ghara ịdị nʼime onye ọbụla nʼetiti unu, nke ga-eme ka unu site nʼiso Chineke dị ndụ tụgharịa. 13 Kama, na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị niile dịka a kpọrọ ụbọchị ahụ Taa. Ka a hapụ inwekwa onye ọbụla a ga-esite nʼaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike. 15 Dị ka e kwuru ya,
"Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya.
Unu emela ka obi unu sie ike,
dịka unu mere nʼoge nnupu isi."3:15 Abụ 95:7,8