Publicidade

Hebreus 5

1 A na-esite nʼetiti ndị mmadụ họrọ onyeisi nchụaja ọbụla, ka nnọchite anya ndị mmadụ nʼihe banyere ife Chineke, ka na-eche onyinye na-achụkwa aja maka mmehie dị iche iche. 2 Ebe bụ na ya onwe ya bụ onye na-adịghị ike, pụrụ iji nwayọọ na-emeso ndị na-amaghị ihe na ndị na-ejehie ụzọ omume. 3 Nʼihi nke a, ghaghị ịchụ aja maka mmehie nke onwe ya na nke ndị mmadụ. 4 O nweghị onye na-ewere ugwu a nʼonwe ya, kama bụ Chineke na-akpọ dịka o si kpọọ Erọn.

5 Nʼotu aka ahụ kwa, Kraịst enyeghị onwe ya ebube nke ịbụ onyeisi nchụaja, kama Chineke sịrị ya,

"bụ Ọkpara m.

Taa abụrụla m Nna gị."5:5 Abụ 2:7

6 Nʼebe ọzọ, o kwuru,

"Dị ka usoro Melkizedek si dị,

bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi."5:6 Abụ 110:4

7 Mgbe ka dị ndụ nʼanụ ahụ, o ji oke olu na anya mmiri kpee ekpere rịọkwa arịrịọ nye onye ahụ pụrụ ịzọpụta ya site nʼọnwụ. A nụkwara olu ya nʼihi ndụ nrube isi na mweda nʼala ya. 8 bụ ezie na bụ Ọkpara ma mụtara irube isi site nʼahụhụ tara. 9 Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi. 10 Ebe Chineke mere ya onyeisi nchụaja nʼusoro Melkizedek.

Ịdọ aka na ntị banyere ịdapụ nʼokwukwe

11 dị ọtụtụ ihe ọzọ anyị nwere ikwu banyere ya, ma o siri ike ịkọwa ya nʼihi na unu adịghị amụta ihe ọsịịsọ. 12 Nʼezie, ugbu a, unu kwesiri ịbụ ndị ozizi nye ndị ọzọ, ma unu ka nọ na-achọ onye ga-ezikwa unu ụkpụrụ mbụ nke okwu Chineke. Unu na-achọ mmiri ara kama nri siri ike. 13 Onye ọbụla nke na-aṅụ ara, ka bụ nwantakịrị, matabeghị ozizi banyere ezi omume. 14 Nri dị ike dịrị ndị tozuru oke, ndị siterela nʼihe ha na-eme zụọ onwe ha ịchọpụta ihe dị iche nʼetiti ezi ihe na ajọ ihe.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-