Publicidade

Hebreus 8

Onyeisi nchụaja nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ

1 Isi okwu dị nʼihe niile anyị na-ekwu bụ nke a, na anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a, bụ onye na-anọdụ ala nʼaka nri nke ocheeze onye ahụ kachasị ihe niile elu nʼeluigwe. 2 Onye na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ, bụ ezi ụlọ ikwu ahụ Onyenwe anyị ji aka ya wuo, bụghị mmadụ wuru ya.

3 A họpụtara onyeisi nchụaja ọbụla ka na-achụ aja na-enyekwa onyinye. Nʼihi nke a, o kwesikwara ka nwee ihe ga-eji na-achụ aja. 4 A sịkwarị na nọ nʼụwa, o garaghị a bụ onye nchụaja nʼihi na e nwere ndị nchụaja na-achụ aja dị ka usoro iwu si dị. 5 Ha na-eje ozi nʼebe nsọ ahụ nke bụ oyiyi na onyinyo banyere ihe nke dị nʼeluigwe. bụ nke a mere e ji dọọ Mosis aka na ntị mgbe na-akwado iwu ụlọ ikwu ahụ, "Lezie anya hụ na i mere ihe niile nʼusoro dị ka e si gosiri gị nʼelu ugwu."8:5 Ọpụ 25:40 6 Ma otu dị, natara ọrụ ije ozi karịrị nke ha, dị ka onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ dị elu karịa nke ochie, ebe ọgbụgba ndụ nke ọhụrụ a o mere ka dịrị nʼetiti ya na mmadụ dabeere na nkwa dị mma karịa.

7 bụrụ na ọgbụgba ndụ ochie ahụ zuruoke, garaghị aba uru ka achọwa ọgbụgba ndụ ọzọ. 8 Ma Chineke chọpụtara ezughị oke ha mgbe sịrị,

"Lee, oge na-abịa, ka Onyenwe anyị kwupụtara,

mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ

dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel,

nakwa ụlọ Juda.

9 bụghị ụdị ọgbụgba ndụ

mụ na nna nna ha gbara,

mgbe m jidere ha nʼaka

site nʼala Ijipt dupụta ha,

nʼihi na ha anọgideghị bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi idebe ọgbụgba ndụ m.

Nʼihi ya, echepụrụ ihu m nʼebe ha nọ,

ka Onyenwe anyị kwupụtara.

10 Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ m ga-eme ka dịrị nʼetiti mụ onwe m na ụlọ Izrel,

mgbe oge ndị ahụ gasịrị, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Aga m etinye iwu m nʼime uche ha,

dekwasị ya nʼobi ha.

Aga m abụ Chineke ha,

ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.

11 dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,

maọbụ otu onye asị ibe ya, Mara Onyenwe anyị,

nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,

site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.

12 Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,

agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ."8:12 Jer 31:31-34

13 Mgbe o kwuru okwu banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ, pụtara na nke ochie ahụ abụrụla ihe gabigara agabiga. Ihe dị ochie nke gabigara ga-emesịa ghara ịdịkwa.

Veja também

Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-07-05_19-25-13-