Pular para o conteúdo
Publicidade

Jọn 1

45 Filip chọtara Nataniel sị ya, "Anyị achọtala onye ahụ Mosis dere banyere ya nʼiwu, onye ndị amụma dekwara banyere ya, Jisọs onye Nazaret, nwa Josef."

46 Nataniel sịrị ya, "Ihe ọma ọbụla pụrụ i si na Nazaret pụta?"

Ma Filip sịrị ya, "Bịa ka hụrụ."

47 Mgbe Jisọs hụrụ ka Nataniel na-abịaru ya nso, o kwuru sị, "Leenụ ezi nwa afọ Izrel onye aghụghọ na-adịghị nʼime ya."

48 Nataniel sịrị ya, "Olee otu i si mata onye m bụ?"

Jisọs sịrị ya, "Tupu Filip akpọ gị, ahụlarị m gị ka nọ nʼokpuru osisi fiig."

49 Mgbe ahụ, Nataniel zaghachiri, "Onye ozizi, bụ Ọkpara Chineke; bụ eze Izrel."

50 Jisọs zara sị ya, "I kwere nʼihi na agwara m gị na ahụrụ m gị nʼokpuru osisi fiig? ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a." 51 sịkwara ya, "Nʼezie, nʼezie agwa m unu, unu ga-ahụ eluigwe ka o meghere hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arịgokwuru, ma na-arịdakwuru Nwa nke Mmadụ."

Veja também