Ọnwụ Lazarọs
1 Nʼoge ahụ, ahụ adịghị otu nwoke a na-akpọ Lazarọs onye Betani, nke bụ obodo nta nke Meri na Mata nwanne ya nwanyị. 2 Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Ọ bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa. 3 Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, "Onyenwe anyị, onye ahụ nke ị hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa."
4 Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, "Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama ọ bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto." 5 Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya. 6 Mgbe ọ nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, ọ nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ ọ nọ. 7 Ya mere, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, "Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa."
8 Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, "Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?"
9 Jisọs zara, "Ọ bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na ọ na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ. 10 Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha."
11 Mgbe o kwusiri nke a, ọ gwakwara ha, "Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra."
12 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, "Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ọ ga-adị mma." 13 Ihe Jisọs na-ekwu bụ banyere ọnwụ ya ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ịrahụ ụra efu.
14 Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, "Lazarọs anwụọla.