Pular para o conteúdo
Publicidade

João 11

Ọnwụ Lazarọs

1 Nʼoge ahụ, ahụ adịghị otu nwoke a na-akpọ Lazarọs onye Betani, nke bụ obodo nta nke Meri na Mata nwanne ya nwanyị. 2 Nke a bụ Meri ahụ weere mmanụ otite dị oke ọnụahịa tee Onyenwe anyị, ma jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. bụ nwanne ya nwoke Lazarọs bụ onye nọ nʼọrịa. 3 Nke a mere ụmụnne ya nwanyị zigara Jisọs ozi sị, "Onyenwe anyị, onye ahụ nke hụrụ nʼanya nọ nʼọrịa."

4 Mgbe Jisọs nụrụ ya, sịrị, "Ọrịa a abụghị nke ọnwụ kama bụ iji nye Chineke otuto nakwa ka e site na ya nye Ọkpara Chineke otuto." 5 Jisọs hụrụ Mata, na nwanne ya nwanyị na Lazarọs nʼanya. 6 Mgbe nụrụ na Lazarọs nọ nʼọrịa, nọkwuru mkpụrụ ụbọchị abụọ nʼebe ahụ nọ. 7 Ya mere, gwara ndị na-eso ụzọ ya, "Ngwanụ ka anyị laghachi azụ na Judịa."

8 Ma ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, "Onye ozizi, nʼoge nta gara aga ka ndị Juu chọrọ ịtụ gị nkume. na-agakwa ebe ahụ ọzọ?"

9 Jisọs zara, "bụghị awa iri na abụọ dị nʼotu ehihie nke ụbọchị? Onye na-ejegharị nʼehihie anaghị asụ ngọngọ, nʼihi na na-eji ìhè nke ụwa a ahụ ụzọ. 10 Ma ndị na-ejegharị nʼabalị na-azọhie ụkwụ, nʼihi na ìhè adịghị nʼime ha."

11 Mgbe o kwusiri nke a, gwakwara ha, "Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma ana m aga ịkpọte ya nʼụra."

12 Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, "Onyenwe anyị, bụrụ na na-arahụ ụra, ga-adị mma." 13 Ihe Jisọs na-ekwu bụ banyere ọnwụ ya ma ha chere na na-ekwu banyere ịrahụ ụra efu.

14 Mgbe ahụ, Jisọs gwaghere ha ọnụ, "Lazarọs anwụọla.

Veja também