Jisọs asaa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya
1 Tupu oge Mmemme Ngabiga eruo, Jisọs amatala na oge ọ ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola. Ọ hụrụ ndị nke ya nọ nʼụwa nʼanya, hụkwa ha nʼanya ruo ọgwụgwụ.
2 Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu etinyelarị ya nʼime obi Judas Iskarịọt, nwa Saimọn ka ọ rara ya nye. 3 Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. Ọ maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke. 4 Ya mere, o sitere nʼoche ọ nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya. 5 Ọ wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha.
6 Ọ bịakwutere Saimọn Pita, onye sịrị ya, "Onyenwe m, ị ga-asa m ụkwụ?"
7 Ma Jisọs zara sị ya, "Ị ghọtaghị ihe m na-eme ugbu a, ma emesịa ị ga-aghọta ya."
8 Pita sịrị ya, "Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị."
Jisọs zara ya, "Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla."
9 Saimọn Pita sịrị ya, "Onyenwe m, ọ bụghị naanị ụkwụ m ka ị ga-asa, kama saakwa aka m na isi m."
10 Jisọs sịrị ya, "Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, ọ bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama ọ bụghị unu niile." 11 Nʼihi na ọ maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, "Ọ bụghị unu niile dị ọcha."
12 Mgbe ọ sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, ọ sịrị ha, "Unu ghọtara ihe m meere unu? 13 Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ. 14 Ebe ọ bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu. 15 Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu. 16 Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi. 17 Ọ bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha.