Publicidade

João 13

Jisọs asaa ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya

1 Tupu oge Mmemme Ngabiga eruo, Jisọs amatala na oge ga-ahapụ ụwa lakwuru Nna ya eruola. hụrụ ndị nke ya nọ nʼụwa nʼanya, hụkwa ha nʼanya ruo ọgwụgwụ.

2 Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu etinyelarị ya nʼime obi Judas Iskarịọt, nwa Saimọn ka rara ya nye. 3 Jisọs matara na Nna enyefeela ya ihe niile nʼaka. maara na ya si nʼebe Chineke nọ bịa, matakwa na ya ga-alaghachikwuru Chineke. 4 Ya mere, o sitere nʼoche nọkwasịrị bilie ọtọ, yipụ uwe nke elu ya, chiri akwa mmiri e ji ehicha ahụ kee nʼukwu ya. 5 wụnyere mmiri nʼime efere ịsa aka, bido ịsa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ, jirikwa akwa mmiri ahụ o kere nʼukwu ya na-ehicha ụkwụ ha.

6 bịakwutere Saimọn Pita, onye sịrị ya, "Onyenwe m, ga-asa m ụkwụ?"

7 Ma Jisọs zara sị ya, "ghọtaghị ihe m na-eme ugbu a, ma emesịa ga-aghọta ya."

8 Pita sịrị ya, "gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị."

Jisọs zara ya, "bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla."

9 Saimọn Pita sịrị ya, "Onyenwe m, bụghị naanị ụkwụ m ka ga-asa, kama saakwa aka m na isi m."

10 Jisọs sịrị ya, "Onye ọbụla sara ahụ agaghị asakwa ya ọzọ, bụ naanị ịsa ụkwụ ya dịrị ya nʼihi na ahụ ya niile dị ọcha. Unu dị ọcha, kama bụghị unu niile." 11 Nʼihi na maararị onye ahụ ga-arara ya nye. Ya mere o ji sị, "bụghị unu niile dị ọcha."

12 Mgbe sachasịrị ha ụkwụ, o yiiri uwe ya, nọdụkwa ala ọzọ, sịrị ha, "Unu ghọtara ihe m meere unu? 13 Unu na-akpọ m Onyenwe unu na Nna unu ukwu, unu mere nke ọma nʼihi na nke a ka m bụ. 14 Ebe bụ na mụ onwe m, bụ Nna unu ukwu na Onyenwe unu sachara unu ụkwụ, unu kwesikwara ịsachakwa ụkwụ ibe unu. 15 Nke a bụ ihe nṅomi m nyere unu, meenụ dị ka mụ onwe m mere unu. 16 Nʼezie, nʼezie, ohu adịghị adị ukwuu karịa nna ya ukwu, maọbụ onye e ziri ozi a karịa onye ziri ya ozi. 17 bụrụ na unu a mara ihe ndị a, ngọzị ga-adịrị unu ma unu mee ha.

Jisọs agbaa ama maka mgba okpuru ya

18 "Anaghị m ekwu maka unu niile, amaara m ndị m họpụtara. Ma nke a bụ imezu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ, Onye mụ na ya na-erikọ nri ebiliela megide m.

19 "Ana m agwa unu ugbu a tupu ihe ndị a emee, ka unu kwere na mụ bụ ya mgbe ga-emezu. 20 Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, onye ọbụla nabatara onye m zitere nabatara m. Onye ọbụla nabatara m nabatakwara onye zitere m."

21 Mgbe Jisọs kwusiri ihe ndị a, o nweghị udo nʼime mmụọ ya. gbara ama sị, "Nʼezie, nʼezie, a sị m unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye."

22 Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya na-eche nʼime obi ha onye na-ekwu maka ya. 23 Otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya nke Jisọs hụrụ nʼanya dabere ya nso. 24 Saimọn Pita fufeere ya isi, ka , Jụọ ya onye na-ekwu maka ya.

25 Ebe dabere Jisọs nso, sịrị ya, "Onyenwe anyị, onye ka bụ?"

26 Jisọs zara, "bụ onye ahụ m ga-enye iberibe achịcha a mgbe m sunyere ya nʼime efere nri." Mgbe o sunyesịrị achịcha ahụ nʼime efere ahụ, o nyere ya Judas nwa Saimọn Iskarịọt. 27 Mgbe narasịrị iberibe achịcha ahụ, ekwensu bara nʼime ya.

Jisọs sịrị ya, "Ihe ọbụla chọrọ ime, mee ya ngwangwa." 28 Ma dịghị onye ọbụla so nọrọ nʼoche nri ghọtara ihe mere o ji gwa ya otu a. 29 Nʼihi na ụfọdụ na-eche, ebe Judas ji akpa ego ha, Jisọs na-asị ya ka gaa zụta ihe ndị dị mkpa maka mmemme, maọbụ ka gaa nye ndị ogbenye ihe. 30 Mgbe natachara iberibe achịcha ahụ, pụrụ na-atụfughị oge, ọchịchịrị agbaala.

Jisọs agbaa ama na Pita ga-agọnarị ya

31 Mgbe pụrụ, Jisọs sịrị, "Ugbu a ka a na-enye Nwa nke Mmadụ otuto, a na-enyekwa Chineke otuto nʼime ya. 32 bụrụ na e nye Chineke otuto nʼime ya, Chineke ga-enyekwa Ọkpara ya otuto nʼime onwe ya, ga-enyekwa ya otuto ahụ ngwangwa.

33 "Ụmụntakịrị m, enwere m oge ntakịrị nke mụ na unu ga-anọ. Unu ga-achọ m, ma dị ka m gwara ndị Juu ka m na-agwa unu ugbu a. Ebe m na-aga unu enweghị ike ịbịa ya.

34 "Ana m enye unu iwu ọhụrụ: Hụrịtanụ onwe unu nʼanya. Dị ka m hụrụ unu nʼanya, otu a ka unu ga-esi hụrịta onwe unu nʼanya. 35 bụrụ na unu ahụrịta onwe unu nʼanya, otu a ka mmadụ niile ga-esi mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m."

36 Saimọn Pita sịrị ya, "Onyenwe anyị ebee ka na-aga?"

Jisọs zaghachiri ya, "Ebe m na-aga, i nweghị ike iso m gaa ya ugbu a. Ma ga-abịa ma emesịa."

37 Pita sịrị ya, "Onyenwe anyị, gịnị mere na m apụghị isoro gị ugbu a? Aga m atọgbọ ndụ m nʼihi gị."

38 Jisọs zaghachiri, "I jikeere ịtọgbọ ndụ gị nʼihi m? Nʼezie, nʼezie, asị m gị, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ga-agọnarị m ugboro atọ."

Veja também

Publicidade
Bíblia Online Bíblia Online

Bíblia Online • Versão: 2026-06-29_22-07-56-