16 Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ,14:16 Maọbụ, Onye Inyeaka onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. 17 Onye bụ Mmụọ nke eziokwu. Ndị bi nʼụwa agaghị anabata ya, nʼihi na ha adịghị ahụ ya anya, ha amakwaghị ya. Ma unu maara ya nʼihi na unu na ya nọ, o bikwa nʼime unu. 18 Agaghị m ahapụ unu dị ka ndị na-enweghị nne na nna. Aga m abịakwute unu.
26 Ma Onye Nkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nʼaha m, ga-akụziri unu ihe niile, ọ ga-echetakwara unu ihe niile m gwara unu.