Jisọs emee mmiri ya aghọọ mmanya
1 Nʼụbọchị nke atọ, o nwere mmemme agbamakwụkwọ na Kena nke Galili, nne Jisọs bịakwara ebe ahụ. 2 A kpọkwara Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya oku na mmemme agbamakwụkwọ a. 3 Mgbe mmanya ha gwụrụ, nne Jisọs sịrị ya, "Ha enweghị mmanya."
4 Jisọs sịrị ya, "Nwanyị, gịnị gbasara mụ na gị na nke a? Oge awa m erubeghị."
5 Nne ya gwara ndị na-eje ozi, "Ihe ọbụla ọ gwara unu, meenụ ya."
6 A dọbara ite mmiri nkume isii buru ibu nʼakụkụ ebe ahụ, nke a na-eji agbanye mmiri ndị Juu na-eji asachasị onwe ha ma ha chọọ ikpe ekpere. Otu nʼime ha na-eri ihe dị ka galọọnụ iri abụọ ma ihe ruru iri atọ.2:6 Nke a bụ ihe dị ka lita iri asaa na ise maọbụ ihe ruru narị na iri ise.
7 Jisọs gwara ha, "Gbajuonụ ite ndị a mmiri." Ya mere, ha gbajupụtara ha mmiri.
8 Mgbe ahụ, ọ gwara ha, "Ugbu a, gbapụtanụ ụfọdụ bugara onyeisi oche."
Ha mekwara nke a. 9 Mgbe ahụ onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ. Ọ mataghị ebe o siri pụta (ma ndị na-eje ozi, ndị kutere mmiri ahụ matara), onyeisi oche ahụ kpọpụtara onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ iche 10 sị ya, "Nʼoge mmemme ọbụla, a na-ebu ụzọ buputa mmanya dị ụtọ, ma bupụtakwa nke na-adịghị ụtọ nʼikpeazụ, mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ma i chebere mmanya dị ụtọ buputa ya ugbu a."
11 Nke a bụ mmalite ihe ama Jisọs mere na Kena nke Galili, o sitere na nke a kpughee ebube ya, ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.