Jisọs egosi ndị na-eso ụzọ ya onwe ya
19 Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, "Udo dịrị unu!" 20 Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị.
21 Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, "Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu." 22 Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, "Naranụ Mmụọ Nsọ. 23 Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha."